Psalms 140

Abụ nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid.

Ekpere maka nchebe

1O Onyenwe anyị, dọpụta m site nʼaka ndị na-eme ihe ọjọọ.
Chebe m ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-eme ihe ike dị iche iche.
2Ndị na-atụ atụmatụ ime ihe ọjọọ nʼobi ha
na-akpali agha ụbọchị niile.
3Ha na-eme ire ha ka ha dị nkọ dịka nke agwọ;
elo ajụala dị nʼegbugbere ọnụ ha. Sela

4Chebe m Onyenwe anyị, ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-emebi iwu;
chebe m ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-eme ihe ike,
ndị na-eche echiche ọdịda m.
5Ndị mpako esielera m ọnya igbudu;
ha agbasaala ụgbụ ha na udo ha,
siekwara m ọnya dị iche iche nʼụzọ m na-aga. Sela

6A sịrị m Onyenwe anyị, “Gị onwe gị bụ Chineke m.”
Nụrụ, O Onyenwe anyị, olu arịrịọ m maka amara.
7Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị Onye nzọpụta m dị ike,
ị na-ekpuchi isi m nʼụbọchị agha.
8Ekwekwala ka ndị ajọ omume chọta ihe ha na-achọ, o Onyenwe anyị,
ekwekwala ka nzube ha mezuo. Sela

9Ndị niile gbara m gburugburu na-ebuli isi ha elu na nganga
ka ndụ ọjọọ nke egbugbere ọnụ ha rikpuo ha.
10Ka icheku ọkụ na-ere ere dakwasị ha;
ka a tụba ha nʼime ọkụ na-ere ere,
nʼime olulu apịtị jupụtara, nke ha na-enweghị ike isite nʼime ya pụta ọzọ.
11Ekwela ka ndị na-ekwu okwu nkwulu guzosie ike nʼala,
ka ihe ọjọọ chụda ndị na-eme ihe ike.

12Amaara m na Onyenwe anyị ga-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị ogbenye
na-emekwa ka ndị nọ na mkpa nweta ihe ruuru ha.
13Nʼezie, ndị ezi omume ga-eto aha gị,
ndị ziri ezi ga-ebikwa nʼihu gị.
Copyright information for IboBIU